Ụlọikpe amaala otu nwoke ikpe ọnwụ maka ịmụnye nwunye ya na nwanne ya nwoke ọkụ

Facebook Twitter LinkedIn
Ụlọikpe amaala otu nwoke ikpe ọnwụ maka ịmụnye nwunye ya na nwanne ya nwoke ọkụ

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja amaala out nwoke a kpọrọ Benjamin Ogudoro ikpe ọnwụ maka ịgba nwunye ya na ọgọ ya nwoke ọkụ nke butere ọnwụ ha.

Ụlọikpe kwuru na a ga-egbu nwoke ahụ site n'ịkwụ ya ụdọ.

Ụlọikpe kwuru na nwoke gbara ndị a ọkụ n'ime abalị oge ha na-ehi ụra.

Akụkọ kwuru na nwoke a mụnyere ọkụ n'ụlọ ha mgbe nwunye ya na nwanne ya nwoke nọ n'ime ụlọ ha n'afọ 2022 n'ihi esemokwu dị n'etiti ha. Nwunye ya ahụ Chinyere Ogudoro ka si mba Scotland lọta tupu o zute ọnwụ ya na mberede.

Mgbe Ọkaikpe Sonaike na-ekpe ikpe ahụ n'ụbọchị Tọzde 27 Febụwarị, 2025, o kwuru na ihe akaebe gosiri na nwoke ahụ maara ụma gbuo ndị ahụ, na e kwesịrị ịma ya ikpe ahụ.

O kwuru na ụlọikpe egosila n'ezie na nwoke ahụ mere ihe dị etu a.

"Ọ maara ụma kpaa nkata ma mee mpụ ahụ. Nke a bụ obi ọjọọ dị ukwuu" ka ọkaikpe ahụ kwuru.

Ụlọikpe kwuru na ikpe maara ya n'ebubo ọnụ anọ e boro ya gụnyere igbu mmadụ na ịgba ụlọ ọkụ.

"Maka igbu mmadụ, ahụhụ ụlọikpe a na-ata gị, Benjamin Ogudoro bụ ogbugbu site n'ịkwụ gị ụdọ n'olu."

Maka ịgba ụlọ ọkụ, ụlọikpe tụrụ ya nga mkpụrụọka. Nke a ga-amalite ngwa ngwa ikpe a gwụrụ.

Ụlọikpe kwuru na nwoke enweghi obi nwute ọbụla kamgbe a malitere ikpe ahụ.

Anya hụrụ ka ihe a si mee gwara ụlọikpe na nwunye ya ahụ rere ọkụ nke ukwuu nke mere ụkwụ ya jiri kpajie ma dapụ n'ahụ ya.

Onye nke ọzọ bụ Njoku Ifeanyi Joseph nwụkwara site n'ọkụ ahụ mana ọ bụghị ozugbo ka ọ nwụrụ.

Ụlọikpe kwuru na ha natara ihe akaebe na a hụrụ nwoke ahụ ka o ji mmanụ ụgbọala dịka o si n'ụlọ ahụ ọkụ na-agba na-agbapụta.

Ihe aka ebe ọzọ kwuru na Ifeanyi kọọrọ ndị agbataobi ha etu nwoke si mụnye ha ọkụ, tupu ọ nwụọ.

Etu ihe a si mee

Nwanne ha nwaanyị bụ Edna Durueke dị afọ iri isii na anọ gwara BBC na ihe a mere na Tọzde 31 Maachị, 2022, mgbe Chinyere si mba Scotland lọta.

Edna kwuru na o mere n'abalị mbụ ọ na-ehi ụra n'ụlọ ha dị n'Abule Ado nke dị n'akụkụ Trade fair Legọs.

Ọ sị "ọ bụ abalị mbụ Chinyere lọtara ka ihe a mere, o hiri ụra mana ọ hụghị echi ya anya,"

Durueke sị na Chinyere na di ya kpere udo n'esemokwu ha nwere tupu ọ gawa mba ofesi mana ọ maghị na di ya ka bu ihe ọjọọ n'obi.

"Nwa nwanne m bụ ọnye ọrụ ụlọakụ na-eme ọfụma na Naịjirịa tupu o mee njem, mgbe ahụ ha ka bi n'ụlọ onye ọzọ nwe."

"O mechara nwete ego, zụọ ala ma rụọ ụlọ ahụ dị n'Abulo Ado. O nwetere akwụkwọ ịkpọrọ ezinaụlọ ya gawa ofesi."

"Mana o nweghi onye ma ihe mere dị ya jiri jụụ iso ha gawa mba ofe ma nọrọ na Naịjirịa."

"Ọ nụrụ kepukepu na di ya chọrọ ire ụlọ ha ahụ, mana ka o si dị, o nweghi ike renwuo ụlọ ahụ maka na aha dị n'akwụkwọ ụlọ ahụ bụ nke nwunye ya (Chinyere).

"Ọ dị ka ọ bụ iwe ahụ kpatara o jiri mee ihe o mere maka na o nweghi ihe ọzọ anyị maara na-abụghị na ha sere okwu ma mezie," Edna Durueke kwuru.

admin

admin

Content creator at LTD News. Passionate about delivering high-quality news and stories.

Comments

Leave a Comment

Be the first to comment on this article!
Loading...

Loading next article...

You've read all our articles!

Error loading more articles

loader